Igbo kwenu! Kwenu! Ndi Igbo Kwezuo nu!
Ụmụ okoro na ụmụ agbọghọ,
ndi ikom na ndi inyom, ndi ichie na ndi nze na ọzọ di ichi iche, oke ụnụ efu kwa na ụnụ
o! Nke onye chiri, ya zaa o!
Eji mụ aka na ebe ọbụla ụnụ nọ ugbua na
enwete ozi nke a, na ụnụ
nọ nke ọma, Eji kwa mụ aka na ihe na agazi ru ụnụ, di ka ndi nna nna anyị
ha sịrị agọ ọfọ, ka ije ụnụ, ya na aka ọlụ ụnụ na aga
ra ụnụ were were.
Ọbụ mụ bụ Uche Nworah, ezeudo na Enugwu-Ukwu na ekene ụnụ, asịrị mụ ka mụ were ohere
nke a lụtụ aka na ụfọdụ ụmụ ihe na
eme gasị na obodo anyị bụ Nigeria, ọkachasi ka osiri were
gbasa ma ọbụ kwanụ metụ ta anyị bụ Ndi
Igbo.
Ụnụ lee anya, ụnụ ga aghọta na anyị bụ Ndi Igbo
enwegi zi ọnọdụ ma ọbụ nsọpụlụ
na Nigeria, anyị enwe gi zi ọnụ na ekwuru anyị, ndi
nile ọnụ na eru na okwu, Ndi Igbo jiri aba mba aha pụ sị
go anyị na ụwa nke a, ndi di ka Rt. (Hon) Chief Dr. Nnamdi Azikiwe (Owelle ndi Onicha), Chief Dr. K.O Mbadiwe
(Agada gbachiri ụzọ), Dr M.
I. Ọkpara (M. I. Power), Chief
Dr. Sam Mbakwe (Dee Sam), Eze (Dr.) Akanụ Ịbịam
(Eze Ogo), Mazi Mbọnụ Ojike, Chief (Dr.) Nwafọ Orizu, Dr.
Alvan Ikoku tinyere ọtụtụ ndi ọzọ nwugoro anwụ,
ụdị ndi Late Dr. Mbadiwe lechere anya kpọ ụmụ nwoke timber na caliber.
Ike na ha agwụ zi ndi anyị ka nwere ugbua, ndi
dị ka Chief Dr. Alex Ekwueme, Dr. Ben Nwabueze, Chief
Emeka Ojukwu (Ikemba na Nnewi, Ọnụ na ekwulu ọra na Ana
Igbo), Mazị Ụwazuruike,
Chief Emeka Anyaọkụ na ụfọdụ ndi ọzọ
gasi bụ ọdịnma Ndi Igbo na obi, eji kwa mụ aka na ụnụ ga ekwe na ọbughị ihe nile tara na abalị
bụ anwụ nta, ọbụghị kwa ihe nile toro ogologo dị ka eriri
bụ agwọ.
Na nkọwa, ihe mụ ji na ekwu bụ na ọtụtụ
ndi bụ aha Ndi Igbo na aga ghari na
eme nke a maka ọdinma
nke ha, ya na nke ezi na ụnọ ha sọsọ, ndi di otu a bụ
ndi mụ ga asi na ha ele go mkpụrụ obi ha, resi ekwensu, ndi
di otu a ka ana eji zi di ka ndi ọlụ ka ewere na etisa ala Igbo,
were ihe na eme na Anambra state were ghọta ihe mụ na ekwu, mgbe oji la wụrụ, ndi dị ka
Chris Uba, Chime Nzeribe, Emeka Ofor,
Chimaraoke Nnamani na ndi otu ha ga asara Ndi Igbo asịsa. Na ụbọchị
ikpe azụ, ha ga aza kwara Chineke ajụjụ gbasa ra aka ọrụ
ha na ebe ụmụ (Ndi Igbo) ya nọ.
Ọtụtụ Mba dị iche iche, na ụfọdụ
ndi mmadụ na emegide kwa obodo ya na ụmụ Israel, ha ga kwa esi otu ahụ zaa
ajụjụ, eji mụ aka na ụnụ
anụ la ka anyị bụ Ndi Igbo na ụmụ Israel (ndi Jew) siri were me tụ
ta.
Igwe Osita Agwuna, Eze Enugwu-Ukwu, bụlụ
kwa Igwe Ụmụnri ya na Onye ji Ọfọ Ndi Igbo kwuru okwu
di egwu mgbe ona eme emume igba Ọfala, ya na emume Ịgụ Arọ
na 2001. Osịrị Onye enyelu nya nye, Nye he
ri we nụ. Ihe okwu ya pụtara
bụ na Onye Chineke gọziri nye ya akụ na ụba, tinye
kwuruo ama mụ ihe, ya mee ka orute ụmụnne na ụmụnna
ya, Ndi nile mụ kpọ bụrụ aha na mbụ, ndi ọrụ
na ndi ozi Obasanjo na eso etisa ala
Igbo, Chineke agọzi go ha nye ha akụ na ụba, ọga aka
kwa mma na ha tinye ụfọdụ aku na uba ha na ala Igbo site na
idozi obodo, ha nwere ike lụọ ụzọ, tinye igwe na enye ọkụ,
lụọ ụnọ akwụkwọ, kwụọ rọ ụmụ
akwụkwọ ụgwọ akwụkwọ, ihe ọma ha
nwere ike ime na Ala Igbo buru ibu. Ha mee otua, anyi agaghị echefu ha
maka na Ndi Igbo na ekwu okwu sị na onye
ana ekwu maka ya nwere ihe ọna eme, Onye Chukwu na emere na emekwara ndi ọzọ.
Ha nwe kwara ike kpọta ụfọdụ ndi
oke enyi ha, ndi oke ozu nile ahu nọ na ochichi na Abuja, ka ha bịa
were anya ha were hụ afụfụ anyị na ata na ala Igbo,
tupu ha agbacha okporo ụzọ nke ahụ si Asaba were gawa Owere
na Port Harcourt, ha ga aghọta na onweghi ihe government etiti na emere
Ndi Igbo ma ncha.
Ụmụnne mụ na ụmụnna mu,
odoro mmadu nile anya, dokwa ewu na ọkụkọ anya na Obasanjo kpọrọ anyị bụ
Ndi Igbo asị, obidoro na iwe na ọnụma ojiri were buso anyị
agha na ụzọ nke ya mgbe ana alụ agha Biafra, tinye kwuo ro na
ụmụ okwu di ichi iche ya na ndi oru ya na ekwu, onwe be gi otu ihe
o mere ma ọbụ kwanụ ruo ru Ndi Igbo, e ruo na ike okwa
ochichi, Ndi Igbo bụ ndi ana enye nke ajuru aju, ma ọbụ nke
erifọrọ erifọ, ya mere na ịga na ụlọ ọrụ
di ichi iche nke government nke etiti, enwe gi otu nke nwere isi onye Igbo nọ
na isi ya, Enwe ụmụ nne anyị nke welitere isi obere, a la ha
ezumike nka na ike. Eche gim na anyị ga zi kwa agba nkịtị na
eche ka ihe jiri aka ya gbanwe onwe ya, maka Ndi Igbo na atụ ilu sị
na Onye ndi iro gbara gburu gburu, na eche onwe ya nche mgbe nile. Ọpụtaziri
na anyị nile ga eke nkwucha, maka na nkwucha
abụrọ ụjọ.
Ndi Igbo na atụ kwa ilu sị na okenye anaghị anọ na ụlọ
ewu amụọ na ogbuli. Anyi aga anọ gba nkịtị
ihe ana emebi? Mgbe Adolf Hitler nọ na egbu ndi Jew, ihe so were mee ka
onwe ike gaa na iru bụ maka ndi hụrụ ihe ọna eme gba nkịtị,
nya bụ na oge eru go mgbe anyị ga elebara ọnọdụ
anyị anya. Ya enwe kwa la onye na ime ụnụ ga asi na ọgba sa gị ya, maka na ofu mkpulu aka lụta mmanụ, o zuo aka nile, agwa kwa ntị ma ọnụ gị, egbu pu isi, ntị esoro ya.
Ndi Igbo na kwa ekwu okwu sị na ihere
anaghị eme onye ara, ka ma na ọbụ ụmụnne ya ka ihere na eme. Nya bụ na
ọbụ ndi ihe diri mma ka ihere ga na eme maka na ndi mba ọzọ
ga eji ọnọdụu ndi ihe na esiri ike na ụmụnna ha
were na agwa ha okwu ma ọbụ were na am ha njakịrị tiri
ikọ ha ọnọ.
Enwere ike ebe inọ ugbua, ma ọbụ na
obodo America, obodo United kingdom ma ọbụ na mpaghara mba uwa nile
di ichi iche, ọnọdụ gị amaka, ibi na ezigbo ụlọ,
na arụ ezigbo ọrụ, enwe kwara ike iji ego na achụ ego
(ihe eji mara Ndi Igbo) ọnwa gwụ e nara nnukwu ego, enwe kwara ike ịgba
nwe la akwụ ikike nke ndi Nigeria nara zia akwụkwụ nke obodo
ebe ahụ ibi, ọdi cha kwa mma mana buru na obi na ime gi, ika bụ
kwa nwa afọ Igbo maka na ọbara na esi isi. Na ime ihe ọma
nile ndia mere gi, na kwa echeta ụmụnne gi Ndi Igbo ndi nke ka nọ
na Nigeria ji eze na ekpere ekwere,
ndi ihe na esiri ike site na mmegbu government etiti Nigeria na emegbu ha.
Isi okwu mụ bụ ka iba nye na otu Ndi Igbo ọbụla
di gị nso, na akwado ha site na itụ ụtụ gi, ya na ije
nzukọ ha, ma ọbụ kwanụ na ụzọ ọbụla
inwere ike, na icheta okwu Martin Luther
King Jnr. gwara ndi isi oji na America gbasa ra otu ha, omere ka ha mata na
onye ọbụla na akwa do gi otu nke nkwụsị mmegbu ndi isi
oji na America, na agba nye gị na onye ahụ bụ onye isi oji,
aga agụnye ya ka onye ọcha ma ọbụ kwanụ onye iro.
Ụnụ ma na Ndi Igbo na asị na Igwe bụ ike, ọbụ
kwanụ ezi okwu. Enwere ike ụnụ,
ndi nna ụnụ ma ọbụ
ndi nna nna ụnụ so lụọ
agha Biafra, ya mere ụfọdụ na ime ụnụ achọ gị ịkwado ụmụ
otu Biafra di ichi che, ụta adị gịrị ụnụ, kama ghọta kwanụ
na otu Biafra nke ugbua di iche na otu ndi mbụ, otu Biafra nke kita abu
gi zi ihe ikwa mgbo ka mgbe ochie, ihe di iche oge nke ugbua bụ na ọbụ
ọgụgụ isi ka anyị ga eji lụọ agha nke
ugbua, otu ndi obodo Czechoslovakia, mba Russia na obodo ndi ọzọ di
iche iche siri were lụọ agha inwere onwe ha.
Ọbụ rụ
na ịna ekwu maka mmegbu Ndi Igbo na Nigeria, na kwa ede maka ya,
nwe ike na edere onye nnọchita anya gi na ulo nzukọ ukwu nke obodo ọbụla
ebe ibi, onye ọbụla ga akpụ Biafra na onu, o ga enye kwa aka.
Ka anyị na eme nke a, ọdịkwa mma ka anyị
nwe ihe ndi oyibo na akpọ plan B (ma nke mbụ emegị, kedu zi
ihe ọzọ anyị ga eme?), ọbụrụ na Ndi Igbo ga
anọ na ime obodo Nigeria, gịnị ga abụ ọnọdụ
anyị? Kedu ka anyị ga esi na aga na iru? Na uche nke mụ (uche onye adị ya njọ), ọdịkwa
mma ka anyị nile dụọ onwe anyị ọdụ mara na
ezi okwu ndi wụ ezigbo ndi enyi anyị, ya na ndi bụ ọdị
mma anyị na obi.
Ndi ọchịchị anyị, ya na ndi anyị
ga asị na ha bụ ndi anyị ji eje mba ga akwụsị oke
nfegharị, ya na oke ashawo ndọrọ ndọ ochịchị
eji mara ha, ọga enye aka ma ha kwudo ofu ebe kwudo sie ike, ka anyị
nwa bụ ndi ha na anọ chite anya nwe ike inwe obi sike ike ya na nsọpụlụ
ebe ha nọ.
Ọwụ ezi okwu na ihe eji mara ndiIgbo bụ
iji ego na achụ ego, mana anyị lee anya anyị ga ahụ na
ihe na ha agba nwe na ụwa nile, ọdi kwa mma ka anyị bụ
Ndi Igbo soro kwa na agbanwe, eme gi otua ga ebute oge ịgbanarị anyị,
oga eme kwa ndi Hausa, ndi Yoruba
na ndi ọzọ kwa na Nigeria ga na anọkpa
anyị ahụ, ya bụ ka iji ego na achụ ego nke anyị
hapụ ịwụ sọ ịzụ ahịa na Idumota,
Ochanja ma ọbụ Ariaria market, ka anyị bido na kwa eche
echiche gbasara iyiwe ihe ndi oyibo na akpo conglomerates, otu ndi Yoruba si
eme, eji mụ aka na ụnụ
na anụ aha ndi a: Tejuoso,
Adenuga, Balogun, Abiola, Otedola,
Dantata, Dangote na ndi ọzọ ga si, isi okwu mụ bụ
na Ndi Igbo akalị go ịna atụtụ penny penny na afụ
afụ eji mara anyị, nke a mere na ndi ochịchị Nigeria na
eji iwu akụsa ọnọdụ
ahịa anyị, anyị nile ga echeta ka ha si were iwu afọ
iri were kusa ọnọdụ Ndi Igbo na azụ ahịa ụgbọ
ala na Berger, ya na Maza Maza Lagos.
Ugbua ha ewere kwa la iwu ndi ọzọ na emegide
ndi na atụ ahịa okporoko, akwa ọhụrụ ya na akwa ọkịrịka,
akpụkpọ ukwu ya na ngwa ahịa ndi ọzọ di ichi
iche. E ji mụ aka na ụfọdi ụmụ afọ Igbo,
ndi di ka Annie Okonkwo (Clemco
group), Orji Uzor kalu (Slok group)
ga eji si ike zụọ ụlọ ahịa ha zụpụta
ya, ka okwudo sie ike, na ada ụda ka ụlọ ahịa ndi
Yoruba na ndi Awụsa mkpọ buru aha, Oru go mgbe mkparị na njakịrị
ana enye, na kwa ama Ndi Igbo ga akwụsị, ụmụ okwu di
ka: nna, container mụ nọ na high sea! Ọdị zia ka ọbụ
sọ sọ ahịa container na spare parts ka Ndi Igbo na azụ,
na anyị enwere zi ụbụlụ ma ọbụ akọ na
uche.
Ihe mmụta ebe a wu ka Ndi Igbo na gha chi na ulo akwukwo,
ndi oyibo sịrị na ọbụ onye nwere mmuta na amamu ihe bụ onye nwere ike, e je na ulo akwukwo di iche iche na uwa nile, ọnụ
ọgụ Ndi Igbo na agbada na ike na ike, ihe mere nke a wụ maka
oke ọchịchọ ya na oke ntụkwa sị obi na ego ụfọdụ
ezi na ụlọ Ndi Igbo nwere, ihe nke a pụtara bụ na mgbe
na abịa na ihu, mgbe ndi Yoruba na ndi Hausa ga na eke ọchịchị
na Nigeria, anyị bụ Ndi Igbo aga gi zi enwe nke ga eru anyị.
Biko nụ, na nụ agbasa ozi a, onye nụ, ya kọrọ ibe
ya ka anyị kwụsi iche kwudo sọ nke nta (I gbu ozu!) maka na nke di na iru ka, ya mere na Ndi Igbo na aba ụmụ
ha ezigbote afa dị ka Nkeiruka.
Atụmatụ ọzọ ga kwa enyere anyị
aka bụ ka Ndi Igbo nile na ụwa nile nwe ifụnanya ebe ibe ha nọ,
ka anyị na ego mi omume ndi Jew, ka ha si ejikọta onwe ha na agba
nye gị afụfụ na nsogbu nile ha ana anata, ihe ọzọ
di kwa n wute bụ omume ufodi ụmụ Igbo, ndi di otu a, ọna
eme ha ihere ịsụ asụsụ Igbo, ụfọdụ ha
anaghị sị ekwete na ha bụ Ndi Igbo, ya mere na ha agba nwe
chala aha na aza zi aha ndi ọcha, ebe a ka mụ sịrị na
eto ndi Yoruba na ndi Hausa, na agbanyegi ebe ọbụ la ha nọ,
asụsụ ha anaghịapụ ha apụ na ọnụ, ha
na aza aha ha na obi ọcha, nke anyị agazi adị iche? Onye ọbụla were ire ya gụọ eze ya ọnụ.
Ụmụnne mụ, anyị na anwa kwa nụ,
ka ana sịrị Ndi Igbo ego anyị ka agha Biafra kwụsịlị,
tinyere ụnọ anyị ndi mba mmiri were, nke ha kpọrọ
‘abandoned property’gbawa anyị aka, anyị eji zi kwa nụ ole
bido?
Anyi gbakwa nụ aka were na
alị enu ọji, mana nkasị obi anyị bụ ihe ngwere kwuru, ọsi na elu daa, lee
anya fe fe na isi si na ọga
eto onwe ya maka na ọdịro ofele, ma ọbụrụ na onwegi onye ga eto ya. Ji sie nụ
ike, ike ụnụ ada la
mba, Chineke ga anọnyere ụnụ
na ezi na ụnọ ụnụ,
nye ụnụ ọmụmụ
na ọzụzụ, Onye nwe anyị ga enye kwa ụnụ ogologo ndụ na
ahụ isi ike, meju pụta kwara ụnụ ebum na obi ụnụ nile.
Ndewo nu!